2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.
3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.
5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.
6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.