Aịzaya 45

Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.

Isaiah 45:5 (UKJV) I am the LORD, and there is none else, there is no God beside me: I girded you, though you have not known me:

3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.

4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.

5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.

6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.

7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.