21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya, ka ha gbaakọkwa izu. Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga, onye kwupụtara ya site na mgbe ochie? Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị? Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m, Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta; ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m.
22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.
23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.
24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’ ” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha.
25Ma agbụrụ niile nke Izrel ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.