1Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.
3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb, unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel, unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.