Aịzaya 47

Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.

Isaiah 47:13 (UKJV) You are wearied in the multitude of your counsels. Let now the astrologers, the stargazers, the monthly sign tellers, stand up, and save you from these things that shall come upon you.

11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.

12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.

13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.

14Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. Ọkụ ga-erechapụkwa ha. Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye, nke a na-anya nʼoge oyi.

15Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị, bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha; ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.