Aịzaya 47

Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.

Isaiah 47:11 (UKJV) Therefore shall evil come upon you; you shall not know from whence it rises: and mischief shall fall upon you; you shall not be able to put it off: and desolation shall come upon you suddenly, which you shall not know.

9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.

10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’

11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.

12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.

13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.