Aịzaya 47

Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’

Isaiah 47:10 (UKJV) For you have trusted in your wickedness: you have said, None sees me. Your wisdom and your knowledge, it has perverted you; and you have said in yours heart, I am, and none else beside me.

8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’

9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.

10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’

11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.

12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.