6Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.
7I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.
8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.
10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’