5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
6Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.
7I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.
8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.