Aịzaya 48

Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.

Isaiah 48:17 (UKJV) Thus says the LORD, your Redeemer, the Holy One of Israel; I am the LORD your God which teaches you to profit, which leads you by the way that you should go.

15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.

16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.

17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.

18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.

19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.