17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”
20Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
21Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta.