Aịzaya 48

Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.

Isaiah 48:9 (UKJV) For my name's sake will I defer mine anger, and for my praise will I refrain for you, that I cut you not off.

7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’

8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.

9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.

10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.

11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.