Aịzaya 49

Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.

Isaiah 49:1 (UKJV) Listen, O isles, unto me; and hearken, all of you people, from far; The LORD has called me from the womb; from the bowels of my mother has he made mention of my name.

1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.

2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.

3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.