14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”
15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.
16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.