Aịzaya 49

Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.

Isaiah 49:18 (UKJV) Lift up yours eyes round about, and behold: all these gather themselves together, and come to you. As I live, says the LORD, you shall surely clothe you with them all, as with an ornament, and bind them on you, as a bride does.

16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.

17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.

18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.

19“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu, ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe, ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị, otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.

20Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka, ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.