21Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’ ”
22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri?
25Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.