24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri?
25Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
26Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha; ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya. Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata, na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị, Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”