9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.