7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
8Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.