Aịzaya 5

Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,

Isaiah 5:22 (UKJV) Woe unto them that are mighty to drink wine, and men of strength to mingle strong drink:

20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.

21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.

22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,

23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.

24Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.