19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”
20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.