Aịzaya 5

Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”

Isaiah 5:19 (UKJV) That say, Let him make speed, and hasten his work, that we may see it: and let the counsel of the Holy One of Israel draw nigh and come, that we may know it!

17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.

18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.

19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”

20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.

21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.