Aịzaya 5

Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.

Isaiah 5:26 (UKJV) And he will lift up an explicit sign to the nations from far, and will hiss unto them from the end of the earth: and, behold, they shall come with speed swiftly:

24Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.

25Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.

27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.

28Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.