26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.
28Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
30Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya dịka mbigbọ nke oke osimiri. A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya, ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu, ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.