Aịzaya 51

Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.

Isaiah 51:17 (UKJV) Awake, awake, stand up, O Jerusalem, which have drunk at the hand of the LORD the cup of his fury; you have drunken the dregs of the cup of trembling, and wrung them out.

15Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”

17Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.

18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.

19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.