Aịzaya 51

Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.

Isaiah 51:18 (UKJV) There is none to guide her among all the sons whom she has brought forth; neither is there any that takes her by the hand of all the sons that she has brought up.

16Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”

17Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.

18Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.

19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?

20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.