20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
22Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
23Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”