Aịzaya 51

Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.

Isaiah 51:21 (UKJV) Therefore hear now this, you afflicted, and drunken, but not with wine:

19Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?

20Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.

21Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.

22Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.

23Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.