Aịzaya 52

Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.

Isaiah 52:13 (UKJV) Behold, my servant shall deal prudently, he shall be exalted and extolled, and be very high.

11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.

12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.

13Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.

14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.

15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.