1Teta, teta gị Zayọn, yikwasị onwe gị ike dịka uwe! Yikwasị onwe gị uwe mara mma, gị Jerusalem, obodo dị nsọ. Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ agaghị abata nʼime gị ọzọ.
2Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla, ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”
4Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri, ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
5“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile.