7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!”
8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.
9Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem.
10Onyenwe anyị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị.
11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.