5“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile.
6Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.”
7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!”
8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.
9Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem.