11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.
15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.