10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.