15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.
16“Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ nke na-eji icheku afụ ọkụ o ji akpụ ihe agha nke mbibi. Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.
17Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.