5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.
7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.
9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.