3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.
4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.
7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị