1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.
2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.