7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.
11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.