Aịzaya 55

Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.

Isaiah 55:11 (UKJV) So shall my word be that goes forth out of my mouth: it shall not return unto me void, but it shall accomplish that which I please, and it shall prosper in the thing whereto I sent it.

9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.

10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.

11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.

12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.

13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.