Aịzaya 56

Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”

Isaiah 56:3 (UKJV) Neither let the son of the stranger, that has joined himself to the LORD, speak, saying, The LORD has utterly separated me from his people: neither let the eunuch say, Behold, I am a dry tree.

1Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị, “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ihe ziri ezi. Nʼihi na nzọpụta m dị nso, ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.

2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”

3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”

4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.

5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.