3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
4Onye ka unu na-akwa emo? Onye ka unu na-akọcha, na-arapụtakwara ire unu? Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi, mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.