Aịzaya 58

“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.

Isaiah 58:1 (UKJV) Cry aloud, spare not, lift up your voice like a trumpet, and show my people their transgression, and the house of Jacob their sins.

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.

2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.

3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.