Aịzaya 58

Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.

Isaiah 58:2 (UKJV) Yet they seek me daily, and delight to know my ways, as a nation that did righteousness, and forsook not the ordinance of their God: they ask of me the ordinances of justice; they take delight in approaching to God.

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.

2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.

3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.

4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.