Aịzaya 59

Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.

Isaiah 59:8 (UKJV) The way of peace they know not; and there is no judgment in their activities: they have made them crooked paths: whosoever goes therein shall not know peace.

6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.

7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.

8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.

9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.

10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.