Aịzaya 59

Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.

Isaiah 59:9 (UKJV) Therefore is judgment far from us, neither does justice overtake us: we wait for light, but behold obscurity; for brightness, but we walk in darkness.

7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.

8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.

9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.

10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.

11Anyị na-agbọ ụja dịka bịa; anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ. Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka; anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.