Aịzaya 6

Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.

Isaiah 6:1 (UKJV) In the year that king Uzziah died I saw also the LORD sitting upon a throne, high and lifted up, and his train filled the temple.

1Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.

2Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị.

3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.