10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”
11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.
12Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya, ala niile atọgbọkwara nʼefu.
13Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a, a ga-eme ka ọ laa nʼiyi. Ma dịka osisi terebint na osisi ook na-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha, ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ.”