Aịzaya 6

Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.”

Isaiah 6:8 (UKJV) Also I heard the voice of the Lord, saying, Whom shall I send, and who will go for us? Then said I, Here am I; send me.

6Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.

7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”

8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.”

9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’

10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.