7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”
8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.”
9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’
10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”
11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.